Psalms 6

Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke e ji ụbọ akwara abụ. Nʼusoro Sheminit. Abụ Ọma Devid.

Ekpere nʼoge nsogbu

1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.
Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị.
2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.
Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu.
3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.
Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị?

4 Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;
nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.
O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?

6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.

Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,
ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;
ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.

8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,
nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.
9 Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.
Ọ nabatala ekpere m.
10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.
Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
Copyright information for IboBIU